Saturday, September 11, 2021

Biafra Mother land Warriors : Ihe i kwesịrị ịma maka mwakpo ha mere

 



Ihe onyonyo pụtara ihe n'ụtụtu Mọnde bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ gosiri ebe ndị oji egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ndị ọrụ nchekwa Civil Defence nọ ọrụ n'Anambara Steeti.

Onyonyo ahụ gosiri ebe ndị oji egbe ahụ gbaturu otu onye Nigerian Security and Civil Defence Corps (e ji Civil Defence mara) ma napụ ha egbe ha.

Onye na-ese onyonyo ihe a na-eme - bụkwa onye so ndị oji egbe bịa ịkpa ike ha - kwuru na ha natara egbe atọ na mwakpo ahụ.

Dịka amaghị ndị ha bụ, onye a na-esere ha onyonyo sị na ha bụ "Biafra Motherland Warriors".

Ka ha na-eme mwakpo a, otu onye n'ime ndị nchekwa Civil Defence malitere jiri asụsu Igbo rịọwa ha biko dika ha na-achọ igbu ya.

Onye ose onyonyo ha sara ya sị "Igbo gbukwaa gị ebe ahụ!".

Mana, ha mechara sị ya yipu uwe Civil Defence ya ma gbapụya ọsọ.

Aha onyonyo,

Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto

Anyị amaghị ihe mere onye nke ahụ, mana ndị mmadụ na soshal midia nyere aha onye nke anyị hụrụ n'ala dịka Chinedu Chukwubunna Ezenmo.

Nnyocha BBC Igbo gosiri na o nwere onye aha ya bụ Chinedu Ezenmo nwere akara Facebook.

N'ime akara Facebook ahụ, ndị mmadụ dere ozi nke gosiri na ọ dika onye ahụ alala mụọ.

Otu onye ntaakụkọ ya na nwa amadị si otu obodo (Aguata) gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na-egburu ya, ma na ọ bụ n'ọnwa Mee ka ọdachị dakwasịrị ya.

Ọ si na nke a mere na mpaghara Umueri.

BBC Igbo hụkwara akwụkwọ ọkwa ọnwụ nwa amadị a nke kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Mee 21, 2021 ka ọ nwụrụ n'aka ndị oji egbe.Akwụkwọ ọkwa ọnwụ ahụ sịkwa na ọ bụ n'Umuleri ka ihe a mere.

Onye bụ Chinedu Ezenmo?

Ihe ndị ọzọ BBC Igbo chọpụtara maka Maazị Ezenmo bụ na ọ bụ onye obodo Aguluezechukwu nke okpuru ọchịchị Aguata dị n'Enugwu Steetị.

Ọ gara mahadum Nnamdi Azikiwe, nakwa ụlọ ụkọchukwu Bihop Crowther dịcha n'Ọka, isi obodo Anambra steeti.

Ozi di na Facebook ya na-atụ aka na ọ ka mechara ncheta ọmụmụ ya tupu o zute ọnwụ ya n'aka ndị omekome.

Kedụ ihe ndị Civil Defence na-ekwu maka ya?

Ndị ọrụ Civil Defence

EBE FOTO SI,

N'ozi ha wepụtara n'ehihe Mọnde, ndi ọrụ nchekwa Civil Defence kwuru na ọ bụghi eziokwu na a wakporo ndi ọru ha n'Anambara.

Okadigbo Edwin bu ọnụ na-ekwuru ha sịrị na onweghi mwakpo mere na Mọnde.

N'agbanyeghi nke a, ozi Maazị Okadigbo zigaara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee kwuru na ndị oji egbe a maghi ndị ha bụ gburu ndị ọru ha mmadu abụọ n'Umueri.

Ozi ahụ kwukwara na ọ bụ n'ehihe ka mwakpo ahụ mere, dika ọkwa ọnwụ Maazị Ezenmo siri kwuo.

Ha si na ọ bụ ndị ọrụ ha abụọ nwụrụ na ya.

Ọnwụ Maazị Ezenmo gunyere ọnwụ ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na ndi nkiti n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ndị uweojii na ndị gọọmentị na-atu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) aka maka ọgbaghara na mwakpo na-eme na mpaghara ahụ, mana Ipob na-agọ n'aka ha adịghị ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

No comments:

Post a Comment

https://saviournicodemus.blogspot.com

BIAFRA NEWS

BIAFRA NEWS : Simon Ekpa not fighting for Biafra – Uwazuruike

    M ovement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra/Biafra  Independence Movement (MASSOB/BIM) has said the self-acclaime...

BIAFRA NEWS