Monday, May 31, 2021

BIAFRA NEWS : Biafra Remembrance and Sit-at-home. Ihe 11 na-adịghị mma agha na-ebute

 

Ọ bụ eziokwu na Igbo tụrụ ilu sị na agaghị eji maka mgbagbu aghara ọgụ, mana ọ dị mkpa mmadụ ịma ihe ọrụ nyere tupu o tinye isi n'ihe ọ na-achọ ịza oku ya.

Dịka ụfọdụ ndị na-akpọ oku ka e kewaa Naịjiria ka onye ọbụla (ma ndị chọrọ Biafra ma ndị chọrọ Ala Yoruba) nwere onwe ha site n'ịlụ agha ma ọ bụrụ ma o ruo etu ahụ, akụkọ a ga-akọwa ihe ndị nwereike ime ma agha su.

Aha onyonyo,

Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi

Lee ihe iri na otu agha nwereike ibute:

1) Agụụ na Ụbịam

Ndị Igbo
Nkọwa foto,

Foto na-egosi etu ndị mmadụ si kwụrụ n'ahịrị ịnata nri ha ga-eri oge agha Biafra

Ị jụọ ndị hụrụ agha Biafra n'afọ 1967 ruo 1970 ihe ruru mmadụ nde atọ, otu ihe ha ga-agwa gị bụ "agụụ".

Ruo echi, nke a so n'otu ihe ndị hụrụ agha ji etu mkpu na-etisi ya ike sị "Ọzọemena" n'ihi na ndị mmadụ takwutere ya kọnkịrị oge ahụ.

Ịma atụ: Onye na-arịa ọrịa shuga na ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ nwere ihe ndị o na-ekwesịghị iri, ugbua onye ahụ ga-erinwu ihe ndị ahụ, mana agha su, ọ bụzị naanị ihe onye hụrụ ka ọ ga-eri.

2) Ọnọdụ ahụike ọjọọ

Ndị ọrịa na-anata ọgwụgwọ n'oge agha Biafra

Ebe foto si, Centre for Memories

Nkọwa foto,

Ndị ọrịa na-anata ọgwụgwọ n'oge agha Biafra

Onye na-eze mgbọ ọ ga na-achọ etu o si eru ụlọọgwụ?

Ndị ụlọọrụ Centre for Memories wepụtachara foto gosiri etu ndị ọcha si na-enye ndị mmadụ ọgwụ na ihe ahụike ndị ọzọ oge agha Biafra, mana onye ka ị ga-enye ghara ole?

Skip Twitter post, 1

End of Twitter post, 1

Ogbunigwe dakwaanụ n'ụlọọgwụ ebe ị chọrọ ịgbaga?

Ọ bụ eziokwu na ndị gbatagbata dịka "Red Cross" na ndị ọzọ nwereike ịgbata ọsọ enyemaka, mana ọ bụghị onye ọbụla ka ọ ga-eru aka.

Aha onyonyo,

O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme

3) Amaghị onye bụ onye

Ndị agha Biafra
Nkọwa foto,

Foto ụfọdụ ndịagha Biafra

Nke a bụ ọnọdụ Bekee na-akpọ 'enemies within and without'.

Ndị agha na-ejikarị usoro a alụ agha, ọnọdụ ebe mmadụ ga-eme ka ọ kwụnyere gị mana jiri ohere ahụ ghọgbuo gị ma memilaa gị.

Agha su ugbua, ị ga-ama onye bụ onye? Ọ ga-abụ ọnọdụ onye ọbụla ịtụ ibe ya aka ebubo.

4) Mkpachi ngagharị

Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ebe ndị Igbo gbakọrọ n'Awgu, Enugu steeti n'oge agha Biafra n'afọ 1968

Ọ bụ ikike dịrị mmadụ ịgagharị etu na mgbe masịrị ya, mana otu ihe ọzọ agha na-ebute bụ mkpachi ngagharị.

Ewezuga ize mgbọ, ogbunigwe na ngwaagha ndị ọzọ, agha anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ etu masịrị ya n'ihi na "ala adịghị level".

Ma ị nwere akwụkwọ ikike ime njem, ma ị nwere ego, ihe ndị a agaghị azọpụta gị ma agha daa.

5) Ndakpọ Akụnaụba

Agha Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Oge agha, ọ bụrụ na mmadụ kpọsagodu ngwaahịa, onye ji ego o ji azụ?

Ịlụ agha na-eri ego ma na-etipiakwa akụnaụba.

Ndị hụrụ agha Biafra na-akọ maka etu e si nakọrọchaa ndị Igbo akụnaụba ha kpatara tupu agha ebido, ma nye ha naanị paụnd 20 iji bidokwa ụwa n'isi mgbe agha biri.

Nke a so mee ka ndị hụrụ agha buru aka n'isi ruo ugbua na-eti mkpu na ịlụ agha egbe na mma ọzọ abụghị etu ka mma is azọta nnwereonwe.

6) Ọnwụ ndị ị hụrụ n'anya:

Aha onyonyo,

Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'

Agha su ugbua, ọ bụ mmadụ niile ga-agbanwu ọsọ ndụ?

Ụfọdụ ndị ga-agbalahụnwu ọnwụ, mana nke bụ eziokwu bụ na mgbọ nwereike ịtụ ndị aka ha dị ọcha na-esoghi kpọọ oku agha.

Enwere onye ọ ga-amasị ịhụ ọnwụ onye ọ hụrụ n'anya n'ụzọ dị otu a?

7) Idina ụmụnwaanyị na ụmụaka n'ike

Aha onyonyo,

Etu ụmụnwaanyị Biafra si husie anya n'oge agha

Nke a so n'otu ọkpụrụkpụ ihe agha na-ebute. Ọ na-abụkarị ndị a na-alụso agha na-eme nke a iji gosi ndị ha na-alụso agha nkarị.

Ebe ụfọdụ na-ezoro ezo awakpo ụmụnwaanyị na ụmụaka, ndị ọzọ na-eme ya n'ihu di, deede, maọbụ dimkpa ezinaụlọ iji sị ha "ngwa awakpoola m nwa, nwunye, nwanne gị nwaanyị n'ihu gị ngwa gịnị ka ị ga-emeli?"

N'afọ 2014, ngalaba United Nations mere ọgbakọ ebe ha kpara nkata maka ndịagha ịkwụsị iji idina ụmụnwaanyị n'ike emere ngwaagha, mana otu ihe bụ ikwu okwu ihe ọzọ bụ ime ihe e kwuru.

8) Iwu agaghị enwezikwa ire (Breakdown of Law and Order)

Obodo ọbụla nwere iwu na-echekwa ya nke a na-atụ anya na ndị bi ebe ahụ ga na-erubere isi.

Tupu agha ebido, ụfọdụ ndị abụrụla ndị nnupuisi na-anaghị edobe iwu, mana agha bido ọ na-ala kpam kpam.

Ka ọ dị ugbua, elu na ala na-enwuru ọkụ kemgbe izu ole ma ole dịka a na-anụ akụkọ ndị 'unknown gunmen', 'bandits', 'killer herdsmen' bụ ndị na-ejizi aka ha etinye iwu dịka igbu ndị mmadụ aghara aghara nakwa iwakpo ndị nchekwa maọbụ ndị ọbụla ha na-ahụta ka ọgbatuhie.

Ụdịrị ihe a na-eme ka iwu ghara ịdị ire n'ihi na otu ọbụla ga-abụzị onyeisi nke onwe ya, nke a nwereike ime ka ndị agha chọọ iji ohere ahụ tinye onwe ha n'ọnọdụ ebe ha ga-abụzị ọkaịkpe bụrụkwa ndị otu ikpe (judge and jury).

9) Mgbukpọ na nkwafu ọbara (Genocide)

A ga-akọ akụkọ agha Biafra ghara ikwute maka etu ihe ruru mmadụ nde atọ si nwụọ na ya bụ agha?

Ndị mgbọ egbughi, agụụ egbuo ha, nke bụ otu atụmatụ gọọmentị Naịjiria jiri lụtanwuo agha ahụ.

Onye kwuru na a gaghị anwali ijikwa usoro a gbukpọọkwa ndị mmadụ n'Ala Igbo ma agha ọzọ selite isi?

Onye ga-anwụ, onye ga-afọ? Onye ga-ezu oke mgbe agha biri? Ndụ mmadụ agaghị abụzị ihe eji kpọrọ ihe.

Agha na-ebute nnukwu nkwafu ọbara a gaara agbalahụ ma ọ bụrụ na ndị chọrọ ịlụ agha kwenye ịtụkọta isi kpaa ezigbo nkata maka ihe na-ese.

10) Ndakpọ Agụmakwụkwọ

Agha Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

N'oge agha, kama ụmụaka ga-anọ n'ụlọakwụkwọ, ọtụtụ n'ime ha ka a ga-esoro ndị agha buru egbe

Ọ kwa onye dị ndụ na-achọ akwụkwọ ọ na-agụ?

N'oge agha Biafra, ndị dị ka Chinua Achebe bụ odeakwụkwọ mere ka ọha mara na ha ejighi Biafra egwu egwu site n'ịrịọ ndị Yurop na ndị Amerịka maka ọsọ enyemaka.

O bughi akwụkwọ n'isi, kama ọ chọwara etu ọ ga-esi nyere ndị Biafra aka, ọ bụ mgbe agha bichara ka ọ kọwara ihe anya ya hụrụ.

N'ime afọ atọ e jiri lụọ agha Biafra, mmadụ ole hụrụ ohere iji chọọ ihu akwụkwọ maọbụ ụlọakwụkwọ ha ga-aga?

11) Ndịagha bụ mụaka

Ndịagha Biafra

Oge ọbụla agha dara, ọtụtụ ụmụ ntakịrị, ọ kacha ndị nwoke, ka a na-adọbanye ka ha soro buru egbe lụwa ọgụ.

Ọ naghị abụkarị ọnọdụ "sonye ma ọ masị gị", ọtụtụ oge ka ọ na-abụ "Ị ga-esonyerịrị ma ị chọrọ ma ị chọghị".

Onye ga-achọ ka nwa ya maọbụ nwanne ya na-akabeghi aka nọrọ n'ụdị ọnọdụ a?

Aha onyonyo,

Ụmụaka Biafra: Etu ndị etobeghi ntoroọbịa jiri hụ agha

Ihe ndị ọzọ gụnyere:

  • Ndị mmadụ ịbụ ndị mbịarambịara na mba ọzọ n'ihi ịgba ọsọ ndụ
  • Ịrịawa ọrịa echiche nke Bekee kpọrọ Post Traumatic Stress Disorder (PTSD), n'ihi ihe ha gabigara maọbụ ihe ha ji anya hụ.
Aha onyonyo,

Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo

No comments:

Post a Comment

https://saviournicodemus.blogspot.com

BIAFRA NEWS

BIAFRA NEWS : Simon Ekpa not fighting for Biafra – Uwazuruike

    M ovement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra/Biafra  Independence Movement (MASSOB/BIM) has said the self-acclaime...

BIAFRA NEWS