Skip to main content

BIAFRA NEWS : Emmanuel Nwobosi: Ihe ị maghị maka ọchịagha a so Ojukwu kwaa mgbọ n'agha Biafra

 


Onye bụ Emmanuel Nwobosi

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ akwaala arịrị maka ọnwụ Emmanuel Nwobosi, ọchịagha kpara ike oge a lụrụ agha Biafra.

Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano, bụ otu onye n'ime ha, ọ gara njem iti aka n'obi na be Nwobosi n'ụbọchị Tuzde Novemba ụbọchị 24, 2020.




Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ka ọ gara njem iti aka n'obi n'ezinụlọ Nwobosi

Nwobosi gbara afọ iri asatọ na abụọ tupu ọ laa mmụọ mana ihe ndị mmadụ ji echeta ya bụ ịhụnanya ike ọ kpara n'oge agha.

Ị nụchaa akụkọ Nwobosi, ị ga-ekweta ihe Otiegwu bụ Oliver De Coque kwuru sị: "A na-enwe obodo enwe, obodo anaghị eko n'elu ka ụgbọgụrụ'.



Onye bụ Emmanuel Nwobosi?

  • Emmanuel Nwora Nwobosi bụ onye Obosi n'Anambra steeti. Aha echichi ya bụ 'Ogene Obosi'
  • O ji ọkwa 'Captain' nke ndịagha Naịjirịa, mana oge agha malitere, e nyere ya ọkwa 'Major' nke ndịagha Biafra
  • O nwetara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ ndị agha a ma ama bụ 'Royal Military Academy Sandhurst' nke dị na mba UK
  • Nwobosi so na ndị agha weghaara ọchịchị n'ike, nke Bekee kpọrọ 'Coup d'etat', n'ọnwa Jenụwarị afọ 1966
  • Ọ bụ Nwobosi bụ onye ndị agha nke gara Ibadan ma nwuchie ndị ọchịchị nọ ahụ

  •  


  • E mechara nwuchie Nwobosi na ụfọdụ ndị agha ndị ọzọ so kpaa nkata ahụ ma tụkpuo ha n'ụlọ mkpọrọ dị na Kirikiri Legọs, mechaa kpụga ha n'ụlọ mkpọrọ dị n'Enugwu, mechakwaa kpụga ha na nke dị n'Owere.
  • Oge agha Biafra malitere, Ojukwu tọhapụrụ ndị niile nọ na mkpọrọ nke Nwobosi bụ otu n'ime ha.
  • Ojukwu mere Nwobosi onyeisi ndị na-arụkwa ngwa ọgụ, bụ 'Artillery Commander' na Bekee. Isi ụlọorụ ha oge ahụ dị n'Enugu
  • Ogbunigwe 'Shell' tụrụ Nwobosi oge a na-akwa mgbọ n'Obolo-Afọ, tijie ya ngụgụ nakwa ọkpụkpụ azụ, mana ndị agha gbakọtara buga ya ụlọọgwụ ebe e mechara gwọta ya.
  • Mgbe agha kwụsịrị, Nwobosi gbara ọsọ ndụ gbaga mba Guyana nke dị na mpaghara Saut Amerịka.
  • Na mba Guyana, e nyere Nwobosi ọkwa dị elu n'otu ndị agha mba ahụ.
  • O mechara si mba Guyana gaa mba Kanada ma nọọ ebe ahụ ọtụtụ oge tupu ọ lọghachi Naịjirịa.
  • Oge Nwobosi lọghachiri Naịjirịa, ọ malitekwara ịrụrụ Ojukwu ọrụ dịka onye enyemaka ya, mana o kweghị eso Ojukwu banye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ruo oge ọ nwụrụ, Nwobosi bụ onye nkwado nnwereonwe Biafra, n'ihi na o kwuru na Naịjirịa ahụghị ndị Igbo n'anya.
    • Ọ bụkwa onye nkwado otu 'Indigenous People of Biafra nakwa onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.
    • N'ọnwa Jenụwarị afọ 2015, oge gọọmentị Anambra steeti mere ncheta maka ndị nwụrụ n'agha Biafra, nke a kpọrọ 'Ọzọemezina', Nwobosi so na ndị a kwanyeere ugwu.
    • Nwobosi nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020

    N'afọ 2016, Femi Fani-Kayode, jibu ọkwa Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, dere akụkọ etu Nwobosi si wakpo ụlọ nna ya oge ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na 1966.

    Fani-Kayode kọkwara etu Nwobosi na ndịagha ya si gbuo Samuel Akintola, onye ji ọkwa 'Premier' nke mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa oge ahụ.

    O kwuru sị: "A katọrọ m ihe Nwobosi na ndị agha ya mere n'abalị ahụ. Ana m eru uju nwanne nna m bụ Akintola bụ onye ha gburu n'abalị ahụ."

    "Mana anaghị m ama ya maọbụ ndị otu ya ikpe. Naanị Chukwu ka ikpe dịịrị".

    "Ebughị m ihe ọbụla n'obi megide ha. A hapụla m ha n'aka Chineke."

Comments

Popular posts from this blog

Nnamdi Kanu Sends Important Message To IPOB Members From Detention

    The detained leader of the proscribed Indigenous People of Biafra (IPOB), Mazi Nnamdi Kanu, has sent an important message to his followers over the Biafra movement. The embattled separatist according to one of his brothers, Prince Kanu Meme, has asked his disciples to trust and comply with directives from the Directorate of State (DOS). Boasting his belief in the separatist movement’s administrative structure, Kanu said “I’m DOS and DOS is me”.  Naija News understands that the DOS, headed by diaspora-based Chika Edoziem has been contending with authority issues since Kanu’s arrest in Kenya in June 2021. It has been observed that IPOB is in disintegration following Nnamdi Kanu’s rearrest and detention. The present situation of the Biafran movement can be likened to that of sheep without a shepherd. However, Kanu in a conversation with his sib...

BIAFRA NEWS : Justice Nyako Is Partisan, Must Step Down From Nnamdi Kanu’s Case – IPOB

  Justice Nyako Is Partisan, Must Step Down From Nnamdi Kanu’s Case – IPOB  IPOB, which made the demand in a statement issued by its Media and Publicity Secretary, Emma Powerful, condemned what it described as the Nigerian government's political and judicial persecution of Kanu using Justice Nyako.  The Indigenous People of Biafra (IPOB) has asked Justice Binta Nyako of the Federal High Court to step down from the case of its detained leader, Nnamdi Kanu.   Bnbpick.io - Earn Free BNB, Faucet, Multiply BNB game Bnbpick.io https://bnbpick.io Bnbpick.io is an Free BNB faucet that enables users the ability to earn free BNB every hour. You are able solve captchas in order to accrue these litecoins.      IPOB, which made the demand in a statement issued by its Media and Publicity Secretary, Emma Powerful, condemned what it described as the Nigerian government's political and judicial persecution of Kanu using Justice Nyako.  According to Powerfu...

IPOB: The Nigerian Civil War, commonly known as the Biafran War

  THE HISTORY OF BIAFRA AND NIGERIA WAR  Israel, Nigeria and the Biafra civil war    The Nigerian Civil War , commonly known as the Biafran War (6 July 1967 – 15 January 1970), was a war fought between the government of Nigeria and the secessionist state of Biafra. Biafra represented nationalist aspirations of the Igbo people, whose leadership felt they could no longer coexist with the Northern-dominated federal government. The conflict resulted from political, economic, ethnic, cultural and religious tensions which preceded Britain's formal decolonization of Nigeria from 1960 to 1963. Immediate causes of the war in 1966 included a military coup, a counter-coup and persecution of Igbo living in Northern Nigeria. Control over the lucrative oil production in the Niger Delta played a vital strategic role. Within a year, the Federal Government troops surrounded Biafra, capturing coastal oil facilities and the city of Port Harcourt. The blockade imp...